Psalms 73

Nchịkọta Akwụkwọ nke atọ

Abụ Ọma 73–89

Abụ Ọma Asaf.

Ọgwụgwụ nke ndị na-emebi iwu

1Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma,
dịkwara ndị obi ha dị ọcha.

2Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ,
ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.
3Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo ;
mgbe m hụrụ ịba ụba
Maọbụ, udo
nke ndị ajọ omume.

4Ha anaghị adọgbu onwe ha;
ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.
5Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha.
Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.
6Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha;
ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.
7Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta;
echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.
8Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu;
nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.
9Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha,
ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.
10Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha,
na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.
11Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara?
Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”

12Otu a ka ndị ajọ omume dị,
ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.

13Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha,
nʼefu ka m kwọrọ aka
Biri ndụ na-enweghị ntụpọ
m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.
14Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu;
ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.

15Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,”
agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.
16Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile,
ọ ghọọrọ m ihe mwute,
17tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke;
mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.

18Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị;
ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.
19Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya,
bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!
20Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta,
otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara,
ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.

21Mgbe m nọ nʼobi mwute;
mmụọ m dara mba.
22Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe.
Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.

23Ma ana m anọnyere gị mgbe niile;
ị na-ejide m nʼaka nri m.
24Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m,
ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.
25Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị?
Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
26Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba,
ma Chineke bụ ike nke obi m,
na ihe nketa m ruo ebighị ebi.

27Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi.
Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.
28Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso.
Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m.
Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.
Copyright information for IboBIU